1 Chronicles 4

Ụmụ ụmụ Juda

1Ndị ikwu Juda bụ
Perez, Hezrọn, Kami, Hua na Shobal.
2Shobal mụrụ Reaya, onye bụ nna Jahat. Jahat bụ nna Ahumai na Lahad, ndị a bụ ndị ikwu Zorat.
3Ndị a bụ ụmụ Etam:
Jezril, na Ishma, na Idbash, aha nwanne ha nwanyị bụ Hazelelponi.
4Penuel bụ nna Gedoa, Eza bụ nna Husha.
Ndị a bụ ụmụ Hua, bụ ọkpara Efrata, nna Betlehem.
5Ashua nna Tekoa lụrụ ndị nwunye abụọ: Hela na Naara.
6Naara mụtaara ya Ahuzam, na Hefa, na Temeni, na Haahashitari. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Naara.
7Ụmụ ndị ikom Hela mụtara bụ
Zeret, Zoha, Etnan
8na Koz, onye bụ nna Anub na Hazobeba, nakwa nke ikwu Ahahel, nwa Harum.

9Jabez bụ nwoke a na-asọpụrụ karịa ụmụnne ya ndị ikom niile. Nne ya kpọrọ aha ya Jabez, sị, “A mụrụ m ya nʼihe mgbu.” 10Jabez tikuru Chineke Izrel mkpu akwa sị ya, “Biko gọzie m, mee ka oke ala m saa mbara. Kwere ka aka gị dịkwasị m, ma wezuga m site nʼihe mmerụ ahụ ọbụla, ka m si otu a gbanarị ihe mgbu.” Chineke zara ekpere ya meere ya ihe ọ rịọrọ.

11Kelub, nwanne nwoke Shua mụrụ Mehia, nna Eshton, 12Eshton mụrụ Bet-Raafa, na Pasea, na Tihina. Tihina mụrụ Ir Nahash. Ndị a niile bụ ndị ikwu Reka.

13Ụmụ ndị ikom Kenaz mụtara bụ,
Otniel na Seraya.
Otniel amụta
Hatat na Meonotai.
14Meonotai bụ nna Ofra.
Seraya bụ nna Joab,
Joab bụ nna Ge Harashim. A kpọrọ ha Ge Harashim nʼihi na ha bụ ndị ǹka.
15Kaleb nwa Jefune mụrụ
Iru, Elaa na Naam.
Ma Elaa mụrụ
Kenaz.
16Ụmụ ndị ikom Jehalelel mụrụ bụ ndị a:
Zif, Zifa, Tiria na Asarel.
17Ụmụ Ezra bụ
Jeta, Mered, Efaa na Jalon.
Otu nʼime ndị nwunye Mered lụrụ mụtara Miriam, Shamai na Ishba, bụ nna Eshtemoa.
18Ndị a bụkwa ụmụ ndị ikom Bitaya, bụ nwa nwanyị Fero, nke Mered lụrụ.
Nwunye ya nke si nʼebo Juda mụrụ Jered bụ nna Gedoa, Heba nna Soko na Jekutiel nna Zanoa.
19Ụmụ ndị ikom nwunye Hodia, nwanne nwanyị Naham,
bụ nna Keila onye Gam na Eshtemoa onye Maaka.
20Ụmụ ndị ikom Shimon mụrụ bụ
Amnọn, Rina, Ben-Hanan na Tilon.
Ishi mụrụ
Zohet na Ben-Zohet.
21Ụmụ Shela nwa Juda mụrụ bụ
Ịa, nna Leka, Laada, nna Maresha, na ikwu ndị ọrụ ịkpa ezi akwa ọcha nọ na Bet Ashbea
22na Jokim, ndị ikom Koziba, na Joash na Saraf, ndị chịrị na Moab na Jashubi Lehem. Aha ndị a sitere nʼakwụkwọ akụkọ mgbe ochie. 23Ha bụ ndị ọkpụ ite, ndị biri na Netaim ya na Gedera. Ha biri nʼebe ahụ nʼihi ịrụrụ eze ọrụ.

Ụmụ ụmụ Simiọn

24Simiọn mụrụ
Nemuel, Jamin, Jarib, Zera na Shaul.
25Shaul mụrụ Shalum nna Mibsam. Mibsam bụkwa nna Mishma.
26Ụmụ Mishma mụrụ bụ
Hamuel nwa ya, Zakua nwa ya na Shimei nwa ya.

27Shimei mụrụ ndị ikom iri na isii, na ndị inyom isii. Ụmụnne ya ndị ikom enweghị ọtụtụ ụmụ dịka ya onwe ya. Nʼihi ya, ndị ikwu ya adịghị ukwu nʼọnụọgụgụ dịka ndị ọzọ na Juda. 28Ha biri na Bịasheba, Molada, Haza Shual, 29Bilha, Ezem, Tolad, 30Betuel, Homa, Ziklag, 31Bet-Makabot, Haza-Susim, Bet-Biri na Shaaraim. Ọ bụ ha bi nʼobodo ndị a niile tutu ruo nʼoge ọchịchị Devid. 32Obodo gbara ha gburugburu bụ Etam, Ain, Rimọn, Token na Ashan, obodo ise, 33tinyere obodo nta niile gbara obodo ndị a gburugburu ruo na Baalat. Ndị a bụ ebe obibi ha.

Ha nwekwara akwụkwọ usoro ọmụmụ.

34Meshobab, Jamlek,
Josha nwa Amazaya,
35Juel,
Jehu nwa Joshibaya, nwa Seraya, nwa Asiel,
36nakwa Elioenai, Jaakoba, Jeshohaya,
Asaya, Adiel, Jesimiel na Benaya,
37na Ziza nwa Shifi, nwa Alon, nwa Jedaya, nwa Shimri, nwa Shemaya.

38Ndị ikom ndị a e depụtara aha ha bụ ndị ndu ikwu ha.

Ezinaụlọ ha mụbara nke ukwuu,
39ha gakwara na mpụta Gedoa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ndagwurugwu ịchọrọ igwe anụ ụlọ ha ebe ịta nri. 40Ha chọtara ebe ịta ahịhịa anụ ụlọ mara mma, nke sara mbara, nke dị jụụ, bụrụkwa ebe nsogbu na-adịghị. Ụfọdụ nʼime ụmụ Ham ebiela nʼebe ahụ na mbụ.

41Ndị ikom ndị a e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ bịara nʼoge Hezekaya na-achị dịka eze Juda. Ha busoro ụmụ Ham agha nʼebe obibi ha, busokwa ndị Meunim bi nʼebe ahụ agha, bibie ha kpamkpam, dịka ọ dị ruo taa. Emesịa ha bichiri ebe ahụ nʼihi na ebe ịta ahịhịa nke igwe anụ ụlọ ha nʼebe ahụ. 42Ọzọkwa, narị ndị ikom ise nʼime ndị a si nʼebo Simiọn, ndị ndu ha bụ Pelataya, Nearaya, Refaya na Uziel, ụmụ Ishi busoro obodo ugwu ugwu Sia agha. 43Ha gburu ndị Amalek fọdụrụ ndụ nʼebe ahụ, bichie ala ahụ ruo taa.

Copyright information for IboBIU